ABÙ EKÈRECHĪ ÈDÈRÈDE ÌGBÒ: NNYÒCHA SITE N’ÀTÙTÙ KEGBÙRÙGBURÙ

Author: Nnyigide Nkoli Mercy
Department: Igbo, African and Asian Studies
Affiliation: Nnamdi Azikiwe University, Awka

Abụ Igbo bụ otu n’ime ngalaba agụmagụ Igbo. Ụfọdụ ndị odeabụ Igbo na-agbadokarị ụkwụ na ngalaba agụmagụ Igbo a wee na-ezipụta ekerechi dị iche iche n’abụ ha. N’agbanyeghị na ndị odeabụ Igbo na-ezipụta ọtụtụ ekerechi n’abụ ha, nwanchọcha chọpụtara na ụfọdụ ndị ọkammụta agụmagụ Igbo, ndị ntụle, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ kara nwe mmasị n’inyocha ihe ndị ọzọ a na-ezipụta n’abụ Igbo dị ka ihe gbasara ọha obodo, ndọrọndọrọ ọchịchị, jenda, ekpemekpe, omenaala, usoro ịchụ nta akụnaụba, dgz. Nke a na-egosi na ndị a enwekebeghị mmasị n’inyocha ekerechi dị iche iche a na-ezipụta n’abụ Igbo. Ọzọ, n’ọmụmụ agụmagụ Igbo, nwanchọcha chọpụtara na ihe gbasara mmewere abụ, ọkachasị asụsụ abụ Igbo, ka na-agbagwoju ụfọdụ ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ anya. Nke a mere na ọtụtụ n’ime ha kara new mmasị na ngalaba iduuazị na ejije Igbo karịa na ngalaba abụ Igbo. N’aka nke ọzọ, nwanchọcha chọpụtakwara na ụfọdụ mmadụ anaghị elekọta ụfọdụ ekerechi anya out kwesịrị ekwesị. Ụfọdụ akparamagwa mmadụ na-emekpa ekerechi ahụ. Mmekpaahụ ụfọdụ mmadụ na-enye ekerechi so eweta ụfọdụ nsogbu ekereụwa. Nke a pụtara na ụfọdụ ekerechi na-emekpakwa mmadụ ahụ n’uzọ dị iche iche. Ihe ndị a a rụtụgasịrị aka bụ nsogbu nyere nchọcha a. Ebumnuuche nchọcha a bụ ka a chọpụta ma o nwere mmekọrịta dị n’etiti agụmagụ Igbo, ọkachasị abụ ederede Igbo, ekerechi, mmadụ na gburugburu ya. Na nchọcha a, e sitere n’ọyọkọabụ Igbo atọ na akwụkwọ abụ Igbo anọ ndị a wee họrọ abụ ekerechi iri abụọ na abụọ e nyochara: Akpa Uche ( Ekechukwu (Ed.), 1975), Ụtara Ntị ( Emenanjo (Ed.), 1979), Nka Okwu ( Maduekwe, 1982), Akọ Bụ Ndụ ( Chukwuezi, I988), Ije Ụwa ( Okediadi, 2003), Echiche Miri Emi ( Nwadike, 2004), na Akọnauche ( Nwadike (Ed.), 2006). E lebakwara anya n’ekerechi dị iche iche e zipụtara n’abụ ndị a họọrọ nakwa ụzọ dị iche iche e si zipụta ha. Ụdị nchọcha emere bụ nke sọvee. A gbara ụfọdụ ndị odeabụ Igbo, ndị ọkammụta n’agụmagụ Igbo, ndị ọkammụta n’ihe ọmụmụ ekerechi na gburugburu mmadụ nakwa ndị nwere mmasị n’ekerechi ajụjụ ọnụ. A gbasoro usoro atụtụ nnyocha agụmagụ kegburugburu n’inyocha abụ ekerechi ndị a họọrọ. Site na ntụcha e mere, nwanchọcha chọpụtara na e nwere mmekọrịta n’etiti agụmagụ Igbo, ọkachasị abụ Igbo, ekerechi, mmadụ na gburugburu ya. Nwanchọcha chọpụtakwara na abụ ederede Igbo bụ ngalaba agụmagụ Igbo ndị odeabụ na-agbadokarị ụkwụ na ya were na-ezipụta ekerechi. Ụfọdụ ndị odeabụ Igbo na-esite n’abụ ha too ekerechi, zipụta nkamma ha, ọrụ ha na uru dị iche iche ha baara mmadụ. A chọpụtara na ụfọdụ ekerechi na-enye mmadụ ego, ụfọdụ ekerechi bụ nri na-enye ndụ, e jikwa ụfọdụ ekerechi dị ka osisi agwọ ọrịa ma naakwalite ọnọdụ ahụ ike mmadụ. Mmadụ na akụkụ ubi agaghị adịnwu ndụ ma e wezuga ụfọdụ ekerechi. N’aka nke ọzọ, ha na-esitekwa n’abụ ha zipụta ụzọ dị iche iche ekerechi na mmadụ si emekpa onwe ha ahụ nakwa ụfọdụ nsogbu ekereụwa nke a na-eweta dị ka mbize, iju, dgz. nke oke mmiri ozuzo na ihe ndị ọzọ na-eweta. A na-atụ anya na a ga-esite na nchọcha a mee ka mmekọrịta a dị n’etiti agụmagụ Igbo, ekerechi, mmadụ na gburugburu ya dowaga ndị ntule, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ anya. N’ihi nke a, ederede nchọcha a na-ekwusi ike na ọ dị mkpa ka e site n’agụmagụ Igbo kpọlite mmasị na akọnauche ọhanaeze, ọkachasị nke ndị nkụzi, ụmụ akwụkwọ, ndị ọgụụ, ndị onyocha, ndị ọkammụta na ndị niile nwere mmasị na ntolite agụmagụ Igbo n’ilekọta, ichekwa na ịkwagide ọnọdụ ekerechi na gburugburu mmadụ. A naatụnyekwa aro ka ndị odeabụ Igbo guzobe otu edemede abụ n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche, nke a ga-esite na ya chọpụta mkpa ọ dị ka mmadụ na-ebelata mmekpaahụ ọ naenye ekerechi. Ọzọ, ndị ọkammụta n’agụmagụ ga-agba mbọ na-achịkọba ọgbakọ kwa afọ n’ihe gbasara ọnọdụ ekerechi na ndụ mmadụ. Ọ dịkwa mkpa ka a na-enye ndị nchọcha ezi nkwado ka ha nwee ike na-eme nchọcha ma na-edepụtakwa akwụkwọ, jọnal, dgz, ma na-emewanyekwa nchọcha n’agụmagụ Igbo na ekerechi.

For Full Copy of this Document please Visit the Digital Library Help Desk.

Advertisements

Tags: , , , , ,

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out / Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out / Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out / Change )

Google+ photo

You are commenting using your Google+ account. Log Out / Change )

Connecting to %s


%d bloggers like this: